Ihe 10 gbara ọkpụrụkpụ i ga-eji were nwe Ayoba

Ọ BỤ N’EFU

Ayoba anaghị ewepụ ego. I ga-enwe data iji were zigara ndị i ji kọntaktị ha ozi na faịl, mana netwọk ụfọdụ (dịka MTN) nwere ike inye gị data a n’efu.

NNKEKỌRỊTA BU NNEKỌRỊTA

Ịkekọrịta ihe nkiri, ihe oyiyi, ihe ndi a na-ege ege, na faịlụ ndị ọzọ na kọntaktị gị.

Ọ NA-EJIKỌ ỌSỌSỌ

Si n’ebe ideturu aha na kọntaktị ndị mmadụ mee ka unu bịakọta ọnụ na-egbughị oge

OKU

Jiri ngwa a kpọọ ndi mmadụ site na iji njikọ olu gị.

KPARỊTA ỤKA UGBU A

Zipụ ozigbo ma natakwa ozi e dere ede na ozi olu nke onye ọbụla i ji kọntaktị ya.

NCHEKWA

Izo ezo njedebe ruo njedebe pụtara na onye ọzọ agaghị enwe ike ịgụ ozi na mkparịta ụka.

GỊ NA ONYE OBỤLA GA-AKPAKỌRỊTA

Zigara onye ọbụla i ji kọntaktị ya ozi edere ede, n’agbanyeghị ma ha etinyewo Ayoba ma ọ bụ ha etinyerọ.

KA ANYỊ HỤ

Mee ka ndị i ji kọntaktị ha na Ayoba mara ebe ị nọ.

OTU MKPARỊTA ỤKA

Akụkọ na-aka mma ma akarịa abụọ akọ ya! Kwado otu mkparita uka ka ọwere dị mfe ndị enyi gị na ezinụlọ gị ịkparịta ụka otu ebe.

NZIGA/NNATA EGO

Were Mobile Money (ọ na-abịa nso nso a) were zipụ/nata ego.

Banyere anyị

Ayoba bụ ngwa e ji ezipụ ozi ozigbo n’efu ndị Afrịka mere maka ndị Afrịka.

N’agbanyeghị na Afrịka bụ otu kọntinent, omenala dị iche iche juru na ya. Anyị eme ememe ịdi iche nke Afrika site n’ịmepụta ikpo okwu ama-ama eji ezipụ ozi nke na-egosipụta ihe ndị mmadụ chọrọ na ebumnuche ha.

Site na mmalite, Ayoba mepụtara Izo ezo njedebe ruo njedebe i ji were hụ na ha chebe ihe gbasara ndi ojiarụ anyị ma hụkwa maka izu nzuzo ha. Nke a pụtara na onye ọzọ enweghị ike ịgụ ozi na mkparịta ụka, ọbụlagodi ndị otu na Ayoba.

Ka anyị si were mee nkà na ụzụ anyị ka ọ baara onye ọbụla uru pụtara na ndị ojiarụ Ayoba na onye ọbụla nwere ekwentị ga enwe ike zikọrịta ozi ma ọ bụlagodu na ha enwebeghị ngwa Ayoba.

Ugbu a, Ayoba dị maka onye ọbụla nwere ekwentị Androịd ịbudata ya (nkwado maka ikpo okwu na ngwaọrụ ndị ọzọ ga-abịa nso!). Tụkwasị na nke ahụ, anyị na MTN nwere mgbakọta dị mma nke pụtara na anyị nwere ike ịnye Ayoba data n’efu* maka ndị niile natara ụtụ MTN mgbe ọbụla ha zigara onye ha ji kọntaktị ya ozi, ihe nkiri, ihe oyiyi na ihe ndị ọzọ dị iche iche. Tụkwasị na nke ahụ, azịza ọ bụla nke ozi Ayoba ga-abụkwa n’efu* maka ndị niile natara ụtụ MTN, n’agbanyeghị ma ha na-eji ngwa ahụ.

Kedụ ihe ọzọ na-eche Ayoba

Anyị nwere ọtụtụ ihe ọhụrụ na-akpali akpali nke anyị bu n’uche ime maka ọnwa ole na ole sochirinụ ka anyị na-agbasa ozi anyị n’Africa. Nke a gụnyere inwe ike iziga na inweta ego n’ime Ayoba, na kọntaktị dị n’Africa, site n’aka Mobile Money.